Eunice Musiime

onye na-akwado ikike mmadụ na Uganda

Eunice Musiime bụ onye ọka iwu onye Uganda, ọkachamara n'ihe gbasara nwanyị na mmepe. Ọ bụ onye isi nchịkwa ugbu a nke Akina Mama wa Afrika (AMwA).[1] Ọ bụkwa onye isi oche nke Federation of Uganda Women Lawyers (FIDA).[2] Na 1 Jenụwarị 2005, o dere akụkọ gbasara Agriculture Organic na Uganda ya na ndị edemede abụọ ọzọ, Boaz Keizire na Moses Muwanga.[1]

Akụkọ ndụ

dezie

Musiime nwere nzere bachelọ na Iwu sitere na Mahadum Dar es Salaam (Tanzania) yana Master's in Business Administration majoring na nyocha amụma ọha sitere na Mahadum Birmingham. [2] .[3][4][5]

N'agbata 2004 na 2006, Musiime rụrụ ọrụ dịka onye nyocha ya na Advocates Coalition for Development and Environment. Ọ bụ onye isi ngalaba nke amụma na nkwado na Uganda Law Society site na 2006 ruo 2010, yana onye isi oche FIDA-Uganda site na 2014 ruo 2016.[1] Musiime bụ onye isi ụlọ ọrụ Akina Mama wa Afrika ugbua.[6]

Isiokwu ndị e dere

dezie
  • "Ịtọhapụ Onye Ndú n'Ime"[7]
  • "Ọrụ ugbo na Uganda: Mkpa maka usoro iwu dị n'otu". 1 Jenụwarị 2005[1]

Ihe odide

dezie
  1. 1.0 1.1 Musiime. "Organic Agriculture in Uganda: The Need for a Coherent Policy Framework". Organic Agriculture in Uganda. 
  2. Mussime (April 2016). Towards an Equitable and Transformative Continental Free Trade Area: A Heterodox and Feminist Approach | Participant List. daghammarskjold.
  3. Mussime (19 September 2018). Budgeting for Women's Rights. Care International.
  4. "Activists want rape and defilement victims cared for", New Vision, 26 May 2016.
  5. "Slow execution of gender-based violence treaty", New Vision, 27 May 2016.
  6. Message from the Executive Director. Akina Mama wa Afrika ANNUAL REPORT 2018. Akina Mama wa Afrika (2018). Archived from the original on 2024-09-07. Retrieved on 2024-11-30.
  7. Mussime (27 June 2018). "Unleashing the Leader Within". African Feminism.