Egwu Agbachaekurunwa

Egwu Omenala ndị Igbo. Ndị na-agba ya bụ ndị nne maọbu ụmụ nwanyị mụrụ nwa ọhụụ nke ga-enywre ha aka imegharị ahụ ha, kụchalata ibu na abụba nwa
Egwu Agbachaekurunwa
type of dance
mba/obodoNaijiria Dezie
onye na-eme ihe nkirinwanyị Dezie
nchekwa ngwa égwuịgba, Ekwe, Opi Dezie
ndị ji ya eme iheNdị Igbo, Ahiazu Mbaise Dezie

Egwu Agbachaekurunwa[1] bụ ihe eji mara ndi Ụmụcho Ụmụediabali Ihitteaforukwu Ahiazu Mbaise n'Imo steeti. A na-agba ya oge ekeresimasi, ọ bụr na mmadụ nwụọ, ikufute nwa, ihe nrisa, na ihe ndi ọzọ dị iche iche. Nwanyị ọbụlà mụrụ nwa n’ụlọ ọgwụ, a na-eburu egwu a ga n’ ụlọ ọgwụ, gaa kuru ya na nwa kutere di ya. Nwanyị na-alụ dị, tolue ịlụ dị, e ji egwu akpọla ya na di

Mana ana-agbakarịcha ya n' ọnwa Nọvemba rue Disemba n' oge afọ ọhuru. ụmụanyị ndị na anọghi n’obodo na-ekwo egwu a kworo otu ọ dị ụtọ n’egwu ọdịnaala  abata n’obodo[2].

A na eji egwu a enye umunwanyi nọ na dị na-eme isi ike ọzụzụ, site na-iri ha nha. Isi ike a bụ ihe ndi di ka izuo ohi, ịkwaa iko, ịtụ asi na imegbu mmadụ. iwu ndị na ejikọlata nwanyị n' obodo. Ya cheta na aga eri ya iwu, ojikọlata onwe ya.

Na igba egwu a, a na eyi uwe elu ụmụnwanyị, na ichafu isi.

Mkpọpụta dezie



Ngwa egwu eji Akụ ya dezie

Ngwa egwu eji akụ ya bụ isi ogwe, udu, ọyọ, ogele na ọkwá.

Vidio dezie

egwu Agbachaekurunwa








Edensibia dezie

  1. https://commons.wikimedia.org/wiki/File:AGBACHAEKURUNWA_DANCE.ogg
  2. AID Project (2023-2-4). Audiovisual of Igbo Dance. Retrieved on 2023-03-11.