Nzame bụ chi kachasị elu nke e gosipụtara na akụkọ ifo nke ndị Fang nke Equatorial Guinea, Gabon, na Cameroon. A na-eji aha ahụ arụtụ aka na atọ n'ime otu nke chi, nke gụnyere Nzame, Mebere na Nkwa ma a na-ejikwa ya ekwu maka "Nzame", otu n'ime ndị otu atọ na otu a.[1][2][3][4]

Ngosịpụta dezie

Dịka Atọ n'Ime Otu nke chi, Nzame na-ahụ maka ịmepụta eluigwe na ala na ihe niile dị na ya. Dịka otu n'ime chi atọ ahụ, Nzame na-achịkwa ahụ eluigwe, Mebere na Nkwa naa-ahụ maka akụkụ nwanyị na nwoke nke okike, nke gụnyere àgwà ụfọdụ dịka idu ndú (Mebère) na ịma mma (Nkwa).[1][2]

Akụkọ ifo dezie

Okike nke mmadụ mbụ dezie

Mgbe ndị otu atọ n'ime otu ahụ, Nzame, kere eluigwe na ala, Mebere na Nkwa tụụrụ Nzama aro na ha họọrọ onye ndu maka ụwa ọhụrụ e kere eke. Na mbụ, a họpụtara anụmanụ atọ ka ha na-eduga n'ala: enyí, agụ owuru, na enwe. Otú ọ dị, Nzame ekwenyeghị na ya mere chi atọ kere mmadụ mbụ, Fam. Fam bụ na mbụ ezé nke Mebere kere, onye mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, ghọrọ nwoke mbụ n'ụwa. E nyere ya ikike sitere n'aka chi atọ ahụ ma gwa ya ka ọ chịa ụwa. Chi atọ ahụ laghachiri n'eluigwe.[1][2][3]

N'ụzọ dị mwute, mgbe oge ụfọdụ gafere, a chọpụtara na Fam bụ onye ndú obi ọjọọ, onye na-emegbu ụmụ anụmanụ n'ụwa. Fam kpebikwara ịlaghachi azụ na Nzame, onye mechara chọpụta ihe merenụ. Na nzaghachi, Nzame bibiri ihe niile n'ụwa ma e wezụga Fam, onye e nyere anwụghị anwụ. A hụghị Fam ọzọ mgbe nke ahụ gasịrị, ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ. O mechara bụrụ onye akụkọ ifo na-eme ihe ọjọọ nke na'eri ụmụ mmadụ ndị ọzọ.[1][2][3]

Nzame, Mebere, and Nkwa mgbe ahụ kere ụwa ọhụrụ ma kekwaa mmadụ ọhụrụ, Sekume. Adịghị ka Fam, Sekume nwere ike ịwụ anwụ. Ọ ghọrọ nna nna ndị obodo Fang dịka o kechara nwunye ya Mbongwe, site na osisi.[1][2][3]

Edemsibịa dezie

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 Lynch (2010). African Mythology, A to Z (in en). Infobase Publishing. ISBN 978-1-4381-3133-7. 
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 Nzame Re-creates the World (en). Oxford Reference. Retrieved on 2021-02-22.
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 Leeming (2010). Creation Myths of the World: An Encyclopedia (in en). ABC-CLIO. ISBN 978-1-59884-174-9. 
  4. AFRICA :: The Republic of Equatorial Guinea :: Ontario Institute for Studies in Education of the University of Toronto. www.oise.utoronto.ca. Archived from the original on 2022-11-08. Retrieved on 2021-02-22.