Ntọala Fernando Leite Couto


Fundação Fernando Leite Couto, Portuguese maka "Foundation Fernando Leite couto", bụ ntọala n'ebe ọdịnala na isi obodo Mozambique bụ Maputo. E hiwere ya na 2015 ma kpọọ ya aha onye edemede Portuguese-Mozambican Fernando Leite Counto. Ntọala ahụ nwere oche ya n'ụlọ Pancho Guedes mepụtara na Avenida Kim Il Sung 961 na mpaghara Sommerschield.[1]

Fundação Fernando Leite Couto, na Avenida Kim Il Sung 961 na mpaghara Sommerschield nke Maputo

N'afọ 2015, Mia Couto, otu n'ime ndị edemede a ma ama na Mozambique, hiwere Fundação Fernando Leite Couto n'ebumnuche ikwalite nka, ọdịbendị n'akwụkwọ nke Mozambique na inye ha ohere n'isi obodo Mozambique. Ụmụ nwoke atọ nke Fernando Leite Couto, Mia, Fernando Amado na Armando Jorge, meghere ntọala ahụ na Eprel 15, 2015. Ntọala ahụ nwere nnukwu mmemme ọdịbendị ma n'eme atụmatụ inye agụmakwụkwọ na onyinye iji kwalite ndị edemede Mozambik n'eto eto. [2][3]

Ihe owuwu nke ntọala ahụ nwere obere ọba akwụkwọ, obere ụlọ oriri na ọṅụṅụ na oghere maka ihe omume, ọkachasị kọntaktị, ọgụgụ na ihe ngosi. Ọtụtụ ndị Mozambik a ma ama n'ese ihe, ndị n'eti egwu na ndị n'ese foto egosi la ọrụ ha na ntọala ahụ. Mia Couto gosiputara akwụkwọ ọhụrụ ya kachasị ọhụrụ n'ebe ahụ. Ka ọ dị ugbu a, Fundação Fernando Leite Couto aghọwo otu n'ime ebe kachasị mkpa maka ọdịbendị na Maputo.[4]

Ebensidee dezie

Edificio da

  1. Edifício da Fundação Fernando Leite Couto. Pancho Guedes, o grande arquitecto da zona (pt) (2016-08-30). Retrieved on 2016-10-19.
  2. FUNDAÇÃO FERNANDO LEITE COUTO: A preservação do legado de um poeta multifacetado (pt) (2015-04-15). Retrieved on 2016-10-19.
  3. Fundação Fernando Leite Couto nasce em Maputo (pt) (2015-04-16). Retrieved on 2016-10-19.
  4. Fundação Fernando Leite Couto, uma janela para a cultura (pt) (2015-10-27). Archived from the original on 2016-10-19. Retrieved on 2016-10-18.

Njikọ mpụga dezie