Happy Wushilang (amụrụ ya na onwa Mee di Na abali ise, nke afo 2002 na Bokkos) bụ onye obodo Naijiria na-egwu egwuregwu volleyball nke na-egwu dịka onye na-anọghị na Plateau Rocks na ndị otu volleyball ụmụ nwanyị nke mba Naijiria.[1]

Akụkọ ihe mere eme dezie

Ndị otu mba Naịjirịa dezie

Wushilang so n'ime ụmụ nwanyị iri abụọ na anọ na-egwu volleyball edepụtara iji nọchite anya mba Naịjirịa na asọm mpi volleyball ụmụ nwanyị Afrịka nke oge afo 2021 na obodoRwanda site na ubochi 5th Septemba 2021 ruo ubochi 20th Septemba 2021.[2]

Ọ bụ otu n'ime ndị egwuregwu volleyball ụmụ nwanyị nọchitere anya obodo Naijiria n'oge egwuregwu African Beach nke oge afo 2023 nke emere site na ubochi 23rd ruo 30th June 2023 na Yasmine Hammamet resort na Tunisia.[3]

Ọ bụ otu n'ime ndị egwuregwu volleyball nke Samuel Ajayi depụtara iji nọchite anya Naijiria maka Asọmpi Volleyball nke ụmụ nwanyị Africa nke iri abụọ na otu nke na-ewere ọnọdụ site na 14th August ruo 29th August 2023 na Yaounde, Cameroon .[4][5]

Ọ bụkwa otu n'ime ndị otu volleyball ụmụ nwanyị iri na ato nke Naijiria na-anọchite anya mba Naijiria n'egwuregwu nke 2023 Association of National Olympic Committees of Africa (ANOCA) Zone III nke na-ewere ọnọdụ site na 4th ruo 9th December na Lome, Togo.[6]

Wushilang so n'ime ndị egwuregwu volleyball iri na abụọ nke Samuel Ajayi bụ onye isi nchịkwa nke otu egwuregwu volleybball ụmụ nwanyị nke Naịjirịa depụtara maka African Games Qualifiers na Lagos, Naijiria nke na-ewere ọnọdụ na 4th ruo 8th Jenụwarị 2024. [7] [8][9]

Ọ bụ akụkụ ọzọ nke otu egwuregwu volleyball ụmụ nwanyị nke obodo Naijiria nke nọchitere anya Naijiria na 13th African Games nke na-ewere ọnọdụ site na 8th March ruo 23rd March 2024 na mba Ghana.[10][11]

Edensibia dezie

  1. Player - Happy Wushilang - FIVB Continental Olympic Qualification 2020. en.volleyballworld.com. Retrieved on 2024-05-02.
  2. Nigeria (2021-08-21). Volleyball Federation opens camp in Kaduna with 54 players (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News. Retrieved on 2024-05-02.
  3. Sports (2023-06-20). Nigeria's Volleyball unveils squad for African Beach Games (en). Pulse Sports Nigeria. Retrieved on 2024-05-02.
  4. Kuti (2023-08-13). Volleyball: Ajayi unveils squad for 2023 African Women's C'ship (en-GB). ACLSports. Retrieved on 2024-05-02.
  5. Adegboyega (2023-08-05). NVBF invites 19 players for 2023 Continental Championship | Ogun State Broadcasting Corporation (en-US). Retrieved on 2024-05-02.
  6. Kuti (2023-11-30). ANOCA Games: NVBF invites 13 players to camp (en-GB). ACLSports. Retrieved on 2024-05-02.
  7. Kuti (2024-01-03). Ajayi Names 12 players for 13th African Games Qualifiers (en-GB). ACLSports. Retrieved on 2024-05-02.
  8. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified. www.premiumtimesng.com. Retrieved on 2024-05-02.
  9. Ochicha (2024-01-08). Beach Volleyball Players Called To Camp For 2023 African Games Qualifiers in Ghana (en-US). Sports247 Nigeria. Retrieved on 2024-05-02.
  10. Kuti (2024-03-02). NVBF names Ukpabi, 11 others for African Games (en-GB). ACLSports. Retrieved on 2024-05-02.
  11. Nigeria Volleyball: Women's Team-Players List Released For The 13th All African Games In Ghana - Govima News (en-US) (2024-01-19). Retrieved on 2024-05-02.