Oru DAPPLE - DAPPLE Project (Dispersion of Air Pollution and its Penetration into the Local Environment) bụ ọrụ nyocha afọ anọ, nkè UK Engineering and Physical Sciences Research Council kwadoro. Ọ gụnyere njikọ nkè mahadum isii n'etiti afọ 2002 na 2006. Ọrụ ubi dabeere na saịtị dị na njikọ nkè Marylebone Road na Gloucester Place na etiti London.

Nnyocha njem dezie

Dị ka akụkụ nke ọrụ ahụ, e mèrè nnyocha iji tụọ mmetọ ikuku n'oge njem ma lelee ụzọ njem ise màkà ịgafe London. Ọ bụ otu ndị si Imperial College London na Health and Safety Laboratory, Buxton nkè Dr Surbjit Kaur haziri.

Nsonaazụ, nkè e bipụtara na akwụkwọ akụkọ Atmospheric Environment, gosipụtara na ọkwa mmetọ nke ndị mmadụ na-ahụ dị íchè dabere na ụdị njem ha na-eji.[1][2] Ụzọ njem kachasị ize ndụ bụ oche azụ nke ụgbọ ala, na-esote njem bọs, ịgba ịnyịnya ígwè, ịga ije, na ụgbọ ala onwé ónyé na-ekpughe ndị mmadụ na mmetọ kachasị àlà.[3]

Hụkwa dezie

  • Mmetọ ikuku na United Kingdom
  • Okwu gbasara mmetọ ikuku
  • Nkọwa nke mgbasa ikuku
  • Ndepụta nke ụdị mgbasa ikuku

Edensibia dezie

  1. Elsevier publishers, Atmospheric Environment website
  2. A. Dobre (August 2005). "Flow field measurements in the proximity of an urban intersection in London, UK". Atmospheric Environment 39 (26): 4647–4657. DOI:10.1016/j.atmosenv.2005.04.015. 
  3. "Taking A Taxi Could Increase Your Exposure To Pollution", Science Daily, January 11, 2006